13 Nkù cherubim ndia nāb͕asa orú cubit: ha onwe-ha nēguzo kwa n'ukwu-ha, iru-ha che-kwa-ra n'ulo.
14 O me-kwa-ra ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, o we tua akika cherubim n'elu ya.
15 O me kwa n'iru ulo ogidi abua, orú cubit na iri na ise ka ogologo-ha di, isi nke di n'elu-ha n'otù n'otù di kwa cubit ise.
16 O me kwa iyab͕a n'ime-ime-ulo ahu, tiye ha n'elu ogidi ahu; o me-kwa-ra ọgu pomegranate ise, tiye ha n'elu iyab͕a.
17 O guzo ogidi abua ahu n'iru ulo uku Chineke, otù n'aka-nri, otù n'aka-ekpe; o we kpọ aha ogidi aka-nri Jakin, na aha ogidi aka-ekpe Boaz.