2 O we malite iwu ulo ahu n'ubọchi nke-abua n'ọnwa nke-abua, n'arọ nke-anọ ọ bu eze.
3 Ma n'ihe ndia ka adọrọ Solomon aka na nti iwu ulo Chineke. Ogologo-ya na cubit n'ọtùtù mbu di ọgu cubit atọ, obosara-ya di kwa orú cubit.
4 Uzọ-nbata kwa nke di n'iru ulo ahu, ogologo-ya di orú cubit, n'iru obosara ulo ahu, idi-elu-ya di kwa ọgu cubit isi: o we were ọla-edo anāgwaghi agwa machita ya nime.
5 O were kwa osisi fir kpuchie ulo ahu nke di kari uku, o we were ezi ọla-edo kpuchie ya, tua akika nkwu na iyab͕a n'elu ya.
6 O were kwa nkume di oké ọnu-ahia n'ima-nma machita ulo ahu: ọla-edo-ya bu kwa ọla-edo Pavaim.
7 O were kwa ọla-edo kpuchie ulo ahu, bú ntuhie-ya nile, na nbata-uzọ-ya nile, na mb͕idi-ya nile, na ibo-ọnu-uzọ-ya nile; o b͕u-kwa-ra eb͕ub͕u cherubim na mb͕idi-ya nile.
8 O me-kwa-ra ulo nsọ kachasi ulo nsọ nile; ogologo-ya di orú cubit, n'iru obosara ulo ahu, obosara-ya di kwa orú cubit: o were ezi ọla-edo, ra ka nnù talent na ọgu iri, kpuchie ya.