2. Ihe Emere 30:5-11 IGBOB

5 Ha we guzo okwu a, ikwusa n'Israel nile, site na Bia-sheba we rue Dan, ka ha bia imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga nime Jerusalem: n'ihi na ha emeghi ya dika edeworo ya n'akwukwọ n'ọtutu mb͕e gara aga.

6 Ndi-ọb͕a-ọsọ we were akwukwọ-ozi sitere n'aka eze na ndi-isi-ya jeghari n'Israel na Juda nile, na dika ihe eze nyere n'iwu si di, si, Umu Israel, laghachikutenu Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka O we laghachikuru ndi b͕apuru ab͕apu ndi fọduru unu site n'aka ndi-eze Asiria.

7 Unu adi-kwa-la ka nna-unu-hà, na dika umu-nne-unu, ndi mekpuru emekpu megide Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, O we rara ha nye ibu ihe-iju-anya, dika unu onwe-unu nāhu.

8 Ub͕u a unu ekwesila olu-unu ike, dika nna-unu-hà mere; ma nyenu Jehova aka-unu, ba n'ebe nsọ Ya, nke O doworo nsọ rue mb͕e ebighi-ebi, fè-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, òfùfè, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe unu nọ chigharia.

9 N'ihi na asi na unu alaghachikute Jehova, agēnwe obi-ebere n'aru umu-nne-unu na umu-unu n'iru ndi adọtara ha n'agha, ha gābiaghachi kwa n'ala nka: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nēme amara, nwe kwa obi-ebere, Ọ gaghi-esi kwa n'ebe unu nọ wezuga iru-Ya, ọ buru na unu alaghachikute Ya.

10 Ndi-ọb͕a-ọsọ ahu we nāgabiga site n'obodo rue obodo n'ala Efraim na Manase, we rue Zebulun: ha we nāchì ha ọchì, lelì kwa ha anya.

11 Otú ọ di, ndikom ufọdu ndi sitere n'Asha na Manase, site kwa na Zebulun, ruru ala, we bia Jerusalem.