14 Ma mb͕e ha nēweputa ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara akwukwọ iwu Jehova nke enyere site n'aka Moses.
15 Hilkaia we za, si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu.
16 Shefan we būru akwukwọ ahu biakute eze, ọzọ kwa, o weghachiri eze okwu, si, Ihe nile enyere n'aka ndi-orù-gi, ha nēme ya.
17 Ha awupuwo kwa ego nke anāchọta n'ulo Jehova, ha we nye ya n'aka ndi-nlekọta ahu, na n'aka ndi nēje ozi ahu.
18 Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n'iru eze.
19 O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.
20 Eze we nye Hilkaia, na Ahaikam nwa Shefan, na Abdon nwa Maika, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,