1 Josaia we mere Jehova ememe ngabiga nime Jerusalem: ha we b͕ue anu ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu.
2 O we guzo ndi-nchu-àjà n'ihe-ndebe nile ha, me ka ha di ike ifè òfùfè ulo Jehova.
3 Ọ si ndi Livai, bú ndi nēme Israel nile ka ha ghọta ihe, ndi di nsọ n'ebe Jehova nọ, Tiyenu ib͕e nsọ n'ulo ahu nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel, wuru; ibu agaghi-adiri unu n'ubu: ub͕u a fènu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-Ya, bú Israel, òfùfè.
4 Dozi-kwa-nu onwe-unu dika ulo nna-unu-hà si di n'òkè nile unu, dika odide-akwukwọ Devid, bú eze Israel, si di, na dika odide-akwukwọ Solomon nwa-ya si di.
5 Guzo-kwa-nu n'ebe nsọ dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu-nne-unu si di, bú umu ndi Israel, na òkè ulo nna ndi Livai.
6 B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n'aka Moses, si di.