17 Umu Israel ndi ahuru n'ebe ahu we me ememe ngabiga na mb͕e ahu, na ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa.
18 Emeghi kwa ememe ngabiga dika nka n'Israel site n'ubọchi Samuel, bú onye-amuma; ọ dighi kwa eze Israel ọ bula mere ememe ngabiga dika ememe ngabiga ahu nke Josaia mere, ya na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Juda na Israel nile ahuru n'ebe ahu, na ndi bi na Jerusalem.
19 ọ bu n'arọ nke-iri-na-asatọ nke ọbubu-eze Josaia ka emere ememe ngabiga nka.
20 Mb͕e ihe a nile gasiri, mb͕e Josaia dozisiri ulo Chineke, Neko, bú eze Ijipt, rigoro ibuso Kakemish n'akuku Yufretis agha: Josaia we pua izute ya.
21 O we zigara ya ndi-ozi, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, eze Juda? ọ bughi imegide gi onwe-gi ka m'biaworo ta, kama ijekuru ulo ahu nke m'nēbuso ha agha: ma Chineke siri ka m'me ngwa: gi onwe-gi ra aka-gi n'ebe Chineke nọ, Onye nọyerem, ka Ọ ghara ibibi gi.
22 Ma Josaia esighi n'ebe ọ nọ chigharia iru-ya, kama o nwoghariri onwe-ya ibuso ya agha, ọ geghi kwa nti okwu Neko, bú nke sitere n'ọnu Chineke, o we bia ibu agha nime ndagwurugwu Megido.
23 Ndi-ọb͕a-uta we b͕a eze, bú Josaia; eze we si ndi-orù-ya, Bubiganum; n'ihi na ọria nāriam nke-uku.