6 B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n'aka Moses, si di.
7 Josaia we bulie nye umu ndi Israel, bú ndi nile ahuru n'ebe ahu, ìgwè ewu na aturu, bú umu-aturu na umu-ewu, ha nile bu iji chu àjà-ngabiga, ọnu-ọgugu-ha ra ka orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù oké-ehi asa na ọgu iri: ndia sitere n'àkù eze.
8 Ndi-isi-ya buli-kwa-ra onyinye-afọ-ofufo nye ndi ahu, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai. Hilkaia na Zekaraia na Jehiel, bú ndi-ndú ulo Chineke, nyere ndi-nchu-àjà nnù ewu na aturu isi na ọgu iri, na ọgu ehi iri-na-isi, iji chu àjà-ngabiga.
9 Konanaia kwa, na Shemaia na Netanel, bú umu-nne-ya, na Hashabaia na Jeiel na Jozabad, bú ndi-isi nke ndi Livai, buliri nye ndi Livai nnù ewu na aturu iri-na-abua na ọgu iri, na nnù ehi na ọgu ise, iji chu àjà-ngabiga.
10 Ewe dozie òfùfè ahu, ndi-nchu-àjà we guzo n'ebe-nguzo-ha, na ndi Livai n'òkè nile ha, dika ihe eze nyere n'iwu si di.
11 Ha we b͕ue anu ngabiga ahu, ndi-nchu-àjà we wusa ọbara nke ha natara n'aka-ha, ndi Livai we nāb͕a akpukpọ-ha.
12 Ha we wezuga àjà-nsure-ọku, inye ha dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu ndi Israel si di, iweta ha nso Jehova, dika edeworo ya n'akwukwọ Moses. Otú a ka eme-kwa-ra ehi.