2 Joahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem.
3 Eze Ijipt we wezuga ya nime Jerusalem, rie ala ahu nra ọgu talent ọla-ọcha ise na otù talent ọla-edo.
4 Eze Ijipt we me Elaiakim, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem, gugharia ya aha Jehoiakim. Neko we were Joahaz nwa-nne-ya, me ka ọ biarue Ijipt.
5 Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya.
6 Nebukadneza, bú eze Babilon, we rigota imegide ya, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, ime ka o jerue Babilon.
7 Nebukadneza we chiri ufọdu n'ihe ulo Jehova chibata na Babilon, o tiye ha n'ulo uku ya nime Babilon.
8 Ma ihe nile Jehoiakim mere nke fọduru, na ihe-árú-ya nile nke o mere, na ihe achọputaworo imegide ya, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.