14 O me-kwa-ra ihe-ndọkwasi iri ahu, me kwa ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;
15 na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru ya.
16 Na ite nile, na osekè nile, na ndudu nile, na ihe-ha nile, ndia ka Huram nna-ya mere eze, bú Solomon, bayere ulo Jehova, ha bu ọla echichara echicha.
17 Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zerida.
18 Solomon we me ihe ndia nile n'uba nke-uku: n'ihi na achọputaghi ọtùtù ọla ahu.
19 Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Chineke, ebe-ichu-àjà ọla-edo kwa, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ha;
20 na ihe-idọba-oriọna na oriọna nile ha, inwu enwu dika ikpé si di n'iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma;