39 Gi si kwa n'elu-igwe, bú site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru ekpere-ha na aririọ-amara nile ha, mezie ikpé-ha; b͕aghara ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi.
40 Ub͕u a, Chinekem, biko, ka anya-Gi abua nāsaghe, ka nti-Gi abua nāṅa kwa nti, n'ekpere nke ebe a.
41 Ma ub͕u a, bilie, Jehova, bú Chineke, ba n'ebe-izu-ike-Gi, Gi onwe-gi na ib͕e nke ike-Gi: Jehova, bú Chineke, ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri nzọputa dika uwe, ka ndi-ebere-Gi ṅuri kwa ọṅu n'idi-nma.
42 Jehova, bú Chineke, echigharila iru onye-Gi etere manu; cheta ebere nile nke Devid, bú orù-Gi.