7 O we di n'obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo.
8 Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi:
9 otú ọ di gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu; kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n'úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo.
10 Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m'we bilie n'ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n'oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m'we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo,
11 dọba ib͕e ahu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na umu Israel b͕ara.
12 O we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua:
13 (n'ihi na Solomon mere ebe-nguzo di elu nke ọla-cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu, ya di kwa, o we tiye ya n'etiti ogige; o we guzo n'elu ya, b͕u ikperè-ya n'ala n'iru nkpọkọta nile nke Israel, b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:)