10 N'ubọchi nke-orú-na-atọ nke ọnwa nke-asa o we zilaga ndi Israel n'ulo-ikwū-ha, ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nke Jehova mere Devid, me-kwa-ra Solomon, me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.
11 Solomon we wubìe ulo Jehova, na ulo eze: ma ihe nile nke batara n'obi Solomon ime n'ulo Jehova na n'ulo-ya, o mere ka ha ga nke-ọma.
12 Jehova we me ka Solomon hu Ya anya n'abali, Ọ si ya, Anuwom ekpere-gi, rọputa-kwa-ra Onwem ebe a ibu ulo ichu àjà.
13 Asi na eb͕ochim elu-igwe, miri-ozuzo we ghara idi, ma-ọbu asi na enyem igurube iwu iripia ala, ma-ọbu asi na ezitem ajọ ọria nēfe efe n'etiti ndim;
14 ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n'ala, kpe ekpere, chọ irum, si n'uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu.
15 Ub͕u a anyam abua ganāsaghe, ntim abua ganāṅa kwa nti, n'ekpere nke ebe a.
16 Ma ub͕u a arọputawom ulo a, do kwa ya nsọ, ka aham we di n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi: anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile.