7 Solomon we do etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke Solomon mere apughi inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba ahu.
8 Solomon we me ememe na mb͕e ahu ubọchi asa, ya na Israel nile, oké nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt.
9 Ha we me ememe nb͕ochi n'ubọchi nke-asatọ: n'ihi na ha mere ememe ira ebe-ichu-àjà nye Chineke ubọchi asa, me kwa ememe ahu ubọchi asa.
10 N'ubọchi nke-orú-na-atọ nke ọnwa nke-asa o we zilaga ndi Israel n'ulo-ikwū-ha, ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nke Jehova mere Devid, me-kwa-ra Solomon, me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.
11 Solomon we wubìe ulo Jehova, na ulo eze: ma ihe nile nke batara n'obi Solomon ime n'ulo Jehova na n'ulo-ya, o mere ka ha ga nke-ọma.
12 Jehova we me ka Solomon hu Ya anya n'abali, Ọ si ya, Anuwom ekpere-gi, rọputa-kwa-ra Onwem ebe a ibu ulo ichu àjà.
13 Asi na eb͕ochim elu-igwe, miri-ozuzo we ghara idi, ma-ọbu asi na enyem igurube iwu iripia ala, ma-ọbu asi na ezitem ajọ ọria nēfe efe n'etiti ndim;