7 Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'Israel;
8 site n'umu-ha ndi fọduru inọchi ha n'ala, ndi umu Israel nēmeghi ka ha gwusia, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, rue ta.
9 Ma Solomon emeghi ndi-orù site n'umu Israel ije ozi-ya; kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-isi ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya.
10 Ndia bu kwa ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi Solomon nwere, ọgu madu iri-na-abua na iri, ndi nwere ike n'aru ndi ahu.
11 Solomon we me ka nwa-nwayi Fero si n'obodo Devid rigorue ulo ahu nke o wuru nye ya: n'ihi na ọ siri, Nwunye m'nwere agaghi-ebi n'ulo Devid, bú eze Israel, n'ihi na ebe nile di nsọ, bú nke ib͕e Jehova bataworo nime ha.
12 Mb͕e ahu Solomon surere àjà-nsure-ọku nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, nke O wuru n'iru uzọ-nbata,
13 ọbuná dika ihe ubọchi si di n'ubọchi-ya, n'isure àjà-nsure-ọku dika ihe Moses nyere n'iwu si di, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na na mb͕e nile akara àkà, ub͕ò atọ n'arọ, bú n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu.