1 Ma eze-nwayi Sheba nuru akukọ Solomon, we bia iwere ilu di iche iche nwa Solomon nime Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, na camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo n'uba, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, kpayere ya uka nile nke di ya n'obi.
2 Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ dighi kwa okwu ọ bula ezonariri Solomon nke ọ nēgosighi ya.
3 Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe Solomon, na ulo nke o wuru,
4 na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha; na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na uwe-ha; na nrigo-ya nke ọ nārigo n'ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ.
5 O we si eze, Ezi-okwu ka ọ bu, bú okwu nke m'nuru n'alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi.
6 Ma ekweghm okwu nile ha, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera uba amam-ihe-gi: i tukwasiwo ihe n'akukọ nke m'nuru.