5 Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n'azu, rue ya aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko: ma usu-ndi-agha-ya nile siri n'ebe ọ nọ b͕asasia.
6 Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla; ha we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.
7 Ha we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, Nebukadneza me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua, ha were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ha we me ka ọ ba na Babilon.
8 Ma n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadneza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, orù eze Babilon, biaruru Jerusalem:
9 o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.
10 Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.
11 Ma ndi ala ahu nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti igwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ.