13 Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.
14 Elaisha we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie, ọ buru na ahughm Jehoshafat, bú eze Juda, iru-ọma, m'gaghi-elegide anya n'ebe i nọ ma-ọli, m'gaghi-ahu kwa gi anya ma-ọli.
15 Ma ub͕u a kutaranum ọkpọ-ubọ. O rue, mb͕e ọkpọ-ubọ ahu nākpọ, na aka Jehova di n'aru ya.
16 Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Me ndagwurugwu a ka ọ buru olùlù olùlù.
17 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Unu agaghi-ahu ifufe, unu agaghi-ahu kwa oké miri-ozuzo, ma ndagwurugwu ahu gējuputa na miri: unu gāṅu kwa, unu onwe-unu, na anu-ulo-unu, na anumanu-unu nile.
18 Ma nka di nfe n'anya Jehova: Ọ gēnye kwa Moab n'aka-unu.
19 Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula.