39 Otù onye we pua ba n'ọhia ichikọta akwukwọ nri, ọ huta osisi vine ọhia, chikọta afufa-ọhia nime ya nju uwe-ya, bia, biye ha n'ite ofé: n'ihi na ha amaghi ha.
40 Ha we wuputara ndikom ahu, ka ha rie. O rue, mb͕e ha nēri ofé ahu, na ndi ahu tiri nkpu, si, Ọnwu di n'ite, gi onye nke Chineke. Ha apughi kwa iri ya.
41 O we si, Weta-kwa-nu utu ọka. O we tiye ya n'ite ahu, si, Wuputara ndi-ayi, ka ha we rie. Ihe ọjọ adighi kwa n'ite ahu.
42 Ma otù nwoke siri na Beal-shalisha bia, butere onye nke Chineke achicha nke nkpuru mbu, orú ob͕e achicha barley, na ọka nke ubi n'akpa-ya. Ọ we si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie.
43 Onye nējere ya ozi we si, Gini, M'gēche nka n'iru ọgu ndikom ise? Ọ si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie; n'ihi na otú a ka Jehova siri, Ha gēri, rifọ kwa.
44 O we che ya n'iru ha, ha we rie, rifọ kwa, dika okwu Jehova si di.