6 Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm,Nke akwaturu dika n'otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya.
7 Ndi-Nazirait-ya di ọcha kari snow, ha nwuru enwu kari miri-ara-ehi,Ha chara ọbara-ọbara n'aru kari ruby, dika sapphire ka udi-ha di.
8 Udi-aru-ha ab͕awo ọchichiri kari iji-nji; amataghi ha n'èzí:Akpukpọ-ha araparawo n'ọkpukpu-ha; ọ kpọnwuwo, ọ ghọwo ihe di ka osisi.
9 Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo;N'ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi.
10 Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite;Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.
11 Jehova emezuwo ọmuma-Ya, Ọ wupuwo iwe-Ya di ọku;O we suye ọku nime Zaion, o we ripia ntọ-ala-ya nile.
12 Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n'elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa,Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem.