1 Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru:Legide anya, hu ita-uta-ayi.
2 Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ,Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.
3 Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna,Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.
4 Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua;Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.
5 Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi:Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.
6 Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye,Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.
7 Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu;Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.