1 N'arọ nke-atọ nke Sairọs, bú eze Peasia, ekpughere Daniel, onye akpọrọ aha-ya Belteshaza, okwu; ọ bu kwa ezi-okwu ka okwu ahu bu, ọbuná obubu-agha uku: o we ghọta okwu ahu, nghọta di-kwa-ra ya n'ọhù ahu.
2 N'ubọchi ahu mu onwem, bú Daniel, nọ nēru újú ogologo ízù atọ.
3 Nri anāchọsi ike nke-uku ka m'nērighi, anu na manya-vine abàghi kwa n'ọnum, eteghkwam onwem manu maọli, rue mb͕e ogologo ízù atọ ruzuru.
4 Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa mbu, mb͕e mu onwem nọ n'akuku osimiri uku ahu, ya bu Hidekel,
5 m'we welie anyam abua, hu, ma, le, otù onye yiri uwe ọcha, onye ekere ihe-ọkiké ọla-edo ọma nke Ufaz n'úkwù-ya: