Daniel 3 IGBOB

1 Nebukadneza, bú eze, mere onyinyo ọla-edo, idi-elu-ya bu ọgu cubit atọ, obosara-ya bu cubit isi: ọ guzobere ya ọtọ na ndagwurugwu Dura n'ala-ọchichi Babilon.

2 Nebukadneza, bú eze, zi-kwa-ra ka achikọta ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpé, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, ibia n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ.

3 Mb͕e ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpe, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, nēzukọta n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ; ha we nēguzo ọtọ n'iru onyinyo ahu nke Nebukadneza guzobere.

4 Onye-nkwusa nākpọsi kwa nkpu ike, si, Ọ bu unu ka anāgwa okwu, unu ndi di iche iche, na unu mba di iche iche, na unu ndi nāsu asusu di iche iche, si,

5 Na mb͕e ahu mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala, kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ:

6 ma onye ọ bula nke nāgaghi-ada n'ala kpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà ya n'etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu.

7 N'ihi nka, n'otù mb͕e ahu, mb͕e ndi nile di iche nuru olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke ubọ na opì nile di iche iche, ha we nāda n'ala, bú ndi nile di iche iche, na mba nile di iche iche, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ha we nākpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ.

8 N'ihi nka ka ndi Kaldea ufọdu biaruru nso n'otù mb͕e ahu, bo ndi-Ju ebubo.

9 Ha zara, si Nebukadneza, bú eze, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

10 Gi onwe-gi, eze, enyewo iwu, si, na onye ọ bula nke gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu:

11 ma onye ọ bula nke nādaghi n'ala kpọ isi ala, agātubà ya n'etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu.

12 Ndi-Ju ufọdu di ndi i doworo ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon, ha bu Shedrak na Mishak na Abed-nego; ndikom ndia anughi olu-gi, eze: chi-gi nile ka ha nādighi-efè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo nke i guzobeworo ọtọ ka ha nādighi-akpọ isi ala nye.

13 Mb͕e ahu Nebukadneza n'oké iwe na ọnuma-ya siri ka eme Shedrak na Mishak na Abed-nego ka ha bia. Mb͕e ahu ha mere ka ndikom ndia bia n'iru eze.

14 Nebukadneza zara, si ha, Ọ̀ bu ihe unu zubeworo, unu Shedrak, na Mishak, na Abed-nego, na chim ka unu nādighi-efè, ọ̀ bu kwa onyinyo ọla-edo nke m'guzobeworo ọtọ ka unu nādighi-akpọ isi ala nye?

15 Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m'meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà unu n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n'akam?

16 Shedrak na Mishak na Abed-nego zara, si eze, Nebukadneza, ọ dighi ayi onwe-ayi nkpà izaghachi gi okwu bayere nka.

17 Asi na ọ di uzọ ọ bula Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfè puru inaputa ayi, ọ bu n'oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu na n'aka-gi, eze, ka Ọ gānaputa ayi.

18 Ma asi na Ọ pughi inaputa ayi, ka i mara, eze, na chi-gi nile ka ayi nāgaghi-adi nēfè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo ahu nke i guzobeworo ọtọ ka ayi nāgaghi-akpọ isi ala nye.

19 Mb͕e ahu Nebukadneza juputara n'ọnuma, udi iru-ya we b͕anwe imegide Shedrak na Mishak na Abed-nego: ya mere ọ zara, si ka ha me oké ọku ahu ka ọ di ọku ub͕ò asa kari otú anēmeri ka ọ di ọku.

20 Ọ si-kwa-ra ndi-dike ufọdu bu dìnkpà, ndi di n'usu-ndi-agha-ya, ka ha ke Shedrak na Mishak na Abed-nego ab͕u, tubà ha n'oké ọku nēnwu ajọ onwunwu.

21 Mb͕e ahu ekere ndikom ndia ab͕u n'uwe-ukwu-ha, na ákwà-nkechi-isi-ha, na uwe-nwuda-ha, na uwe nile ha, ewe tubà ha n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu.

22 N'ihi nka, n'ihi na okwu eze di ọku ọku, na n'ihi na oké ọku ahu bu ihe emeworo ka ọ dikari ọku ókè, ọbuná ndikom ahu ka ire ọku b͕uru, bú ndi meworo ka Shedrak na Mishak na Abed-nego rigota.

23 Ndikom atọ ndia, bú Shedrak na Mishak na Abed-nego, we da n'ala n'ab͕u n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu.

24 Mb͕e ahu o juru Nebukadneza, bú eze, anya, o we were ọsọ bilie: ọ zara, si ndi-ndum-ọdu-ya, Ọ bughi ndikom atọ ekere ab͕u ayi tubàra n'etiti ọku ahu? Ha zara, si eze, Ọ bu ezie, eze.

25 Ọ zara, si, Le, mu onwem nāhu ndikom anọ atọpuru ab͕u, nējeghari n'etiti ọku ahu, ma emerughi ha ahu; onye ahu nke mere ha anọ yiri nwa nke ndi bu chi n'ile ya anya.

26 Mb͕e ahu Nebukadneza biaruru nso ọnu-uzọ oké ọku ahu nke nēnwu ajọ onwunwu: ọ kwuru, si, Shedrak na Mishak na Abed-nego, unu ndi-orù nke Chineke Nke kachasi ihe nile elu, putanu, bia. Mb͕e ahu Shedrak na Mishak na Abed-nego siri n'etiti ọku ahu puta.

27 Ndi ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi ahu, na ndi ahu nāchi achi, na ndi-ndum-ọdu eze, ebe ha zukọtaworo, ha hu-kwa-ra ndikom ndia, na ọku ahu enweghi ike n'aru-ha, ọku aṅachaghi kwa agiri-isi nke isi-ha, uwe-ukwu-ha ab͕anweghi kwa, ísì ọku agabigaghi kwa n'aru ha.

28 Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha.

29 N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, na ndi ọ bula, ma-ọbu mba ọ bula, ma-ọbu asusu ọ bula, nke gēkwuhie megide Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego, agābọkasi ya, ọ bu kwa ulo-ya ka agēme ebe-ikpofu-ahihia: n'ihi na ọ dighi chi ọzọ nke puru inaputa otú a.

30 Mb͕e ahu eze mere ka ihe gara Shedrak na Mishak na Abednego nke-ọma n'ala ahu anāchi achi, bú Babilon.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12