Daniel 11 IGBOB

1 Ma mu onwem, n'arọ mbu nke Daraiọs, bú onye Midia, nguzo-ọtọm bu ka m'ghọrọ ya onye nējidesi ike na ebe siri ike.

2 Ma ub͕u a ezi-okwu ka m'gēgosi gi. Le, ndi-eze atọ ọzọ ganēguzoro Peasia ọtọ; ma nke-anọ gābu ọgaranya nwe àkù uku kari ha nile: ma mb͕e emere ka ọ di ike site n'àkù-ya, ọ gākpọte ndi-ya nile imegide ala-eze Jevan.

3 Ma otù eze, onye bu dike, gēguzo ọtọ, ọ gāchi kwa achi n'oké ọchichi, me ka o si tọ ya.

4 Ma mb͕e o guzoro ọtọ, agētipia ala-eze-ya, kesa ya na nchere-iru ifufe anọ nke elu-igwe; ma ọ gaghi-adiri umu-ya gānọchi ya, ọ gaghi-adi kwa ka ala-ọchichi-ya nke ọ chiri si di; n'ihi na agēropu ala-eze-ya, ọ gādi-kwa-ra ndi ọzọ nābughi ndia.

5 Ma eze nke Ndida gādi ike, ya na otù nime ndi-isi-ya; ọ gādi kwa ike n'elu ya, chia achi; oké ala-ọchichi ka ala-ọchichi-ya gābu.

6 Ma n'ọgwugwu arọ ufọdu ha gēkekọta onwe-ha; ada eze nke Ndida gābiakute kwa eze Ugwu idozi okwu n'uzọ ziri ezi: ma nwanyi ahu agaghi-anagide ike nke ogwe-aka-ya; nwoke ahu agaghi-eguzogide kwa, ya na ogwe-aka-ya; ma agārara nwanyi ahu nye, ya onwe-ya, na ndi nēme ka ọ bia, na nna muru ya, na nwoke nke nēme ka ọ di ike na mb͕e ahu nile.

7 Ma otù onye gēsi n'ome nke nkpọrọgwu nwan yi ahu nile guzo ọtọ n'ọnọdu nwoke ahu, biakute usu-ndi-agha-ya, bata n'ebe siri ike nke eze Ugwu, megide ha, ghọ onye di ike:

8 ọzọ kwa, chi nile ha, ha na arusi nile ha akpuru akpu, tiyere ihe nile ha anāchọsi ike nke-uku nke ọla-ọcha na nke ọla-edo, ka ọ gādọta n'agha bata n'Ijipt; ma ya onwe-ya gēguzo arọ ufọdu ghara imegide eze Ugwu ahu.

9 Ọ gābata kwa n'ala-eze nke eze Ndida, ma ọ gālaghachi n'ala nke aka ya.

10 Ma umu-ya ndikom gākpali onwe-ha ibu agha, ha gāchikọta kwa ìgwè ọtutu usu-ndi-agha, ọ gābia abia, rubiga ókè dika osimiri, gabiga: ọ gālaghachi kwa, ha gākpali kwa onwe-ha ibu agha rue ebe-ya siri ike.

11 Ma eze Ndida gēwe iwe di ilu, puta, buso ya agha, bú eze Ugwu ahu: ọ gēguzo kwa oké ìgwè madu, ma agēnye ìgwè madu ahu n'aká-ya.

12 Agāchipu kwa ìgwè madu ahu, obi-ya ewe di elu: ọ gēme kwa ka nnù kwuru nnù madu da ada, ma ọ gaghi-adi ike.

13 Ma eze Ugwu ahu gēguzobe kwa ìgwè madu ọzọ bara uba kari ìgwè mbu; ọ bu kwa n'ọgwugwu mb͕e ndia, bú nke arọ ndia, ka ọ gābia abia, chiri usu-ndi-agha di uku, chi kwa ọtutu àkù.

14 Ma na mb͕e ahu ka ọtutu madu gēguzo ọtọ imegide eze Ndida: ọzọ, umu nke ndi nēme ihe-ike n'etiti ndi-gi gēbuli onwe-ha ime ka ọhù ahu guzo; ma ha gāsu ngọngọ.

15 Eze Ugwu ahu gābia kwa, wukọta obo-ihe, were otù obodo nke ewusiri ike nke-uku: ogwe-aka nile nke Ndida agaghi-eguzo kwa, ha na ndi ọ rọputara, ọ dighi kwa ike ọ bula ha nwere iguzo.

16 Ma onye ahu nke nābiakute ya gēme ka o si tọ ya, ọ dighi kwa onye ọ bula ganēguzo n'iru ya; ọ gēguzo kwa n'ala ahu mara nma, ngwusi gādi kwa n'aka-ya.

17 Ọ gēdo kwa iru-ya ibia abia n'ike nke ala-eze-ya nile, ndi ziri ezi gēso kwa ya; ọ gēme kwa ihe: ọ bu kwa ada ndinyom ka ọ gēnye ya, ibibi ya; ma ihe ahu agaghi-eguzo, ọ bughi kwa nke ya ka ọ gābu.

18 Ọ gēchighari kwa iru-ya le agwe-etiti nile, were ọtutu: ma otù ọchi-agha gēme ka ita-uta-ya kwusiri ya; e, ọ gēme kwa ka ita-uta-ya laghachikute ya.

19 Ọ gēchighari kwa iru-ya le ebe nile siri ike nke ala nke aka ya: ma ọ gāsu ngọngọ da, agaghi-ahu kwa ya.

20 Ma otù onye nke nēme ka onye nke nāchi n'ihe-ike gabiga n'ima-nma ala-eze ahu gēguzo ọtọ n'ọnọdu-ya: ma n'ubọchi ole-na-ole ka agētipia ya, ma ọ bughi n'iwe, ọ bughi kwa n'agha.

21 Ma otù onye eledara anya gēguzo ọtọ n'ọnọdu-ya, onye ha nātukwasighi ebube nke ala-eze: ma ọ gābata nime na mb͕e udo, were ire-utọ nile nata ala-eze ahu.

22 Ma ogwe-aka nile nke nrubiga-ókè ahu ka agēji ruchapu ha n'iru ya, tipia ha; e, onye-ndú nke ọb͕ub͕a-ndu kwa.

23 Ma site na mb͕e madu kekọtara onwe-ha n'ebe ọ nọ ọ gālu ọlu aghughọ: ọ gēji kwa otù mba di nta rigo n'elu, nwe ume.

24 Na mb͕e udo na imegide ebe nile di urù nke ala anāchi achi ka ọ gābia; ọ gēme kwa ihe nke nna-ya-hà na ndi bu nna nna-ya-hà nēmeghi; ihe-nluta-n'agha na ihe-nkwata na àkù ka ọ gēkesara ha: ọ bu kwa imegide ebe di iche iche ewusiri ike ka ọ gēchè èchìchè-ya nile, ọbuná rue mb͕e akara àkà.

25 Ọ gākpọte kwa ike-ya na obi-ya imegide eze Ndida chiri oké usu-ndi-agha; eze Ndida gākpali kwa onwe-ya ibu agha chiri oké usu-ndi-agha nke di ike nke-uku: ma ọ gaghi-eguzo, n'ihi na ha gēchè èchìchè di iche iche imegide ya.

26 Ọzọ, ndi nēri ihe-oriri ọma ya gētipia ya, usu-ndi-agha-ya gērubiga ókè dika miri: ọtutu madu gāda kwa n'ala buru ndi eb͕uru eb͕u.

27 Ma eze abua ndia, obi-ha gādi n'ime ihe ọjọ, ọ bu kwa n'otù table ka ha gēkwu okwu-ugha: ma ọ gaghi-aga nke-ọma; n'ihi na ọgwugwu fọduru idi na mb͕e akara àkà.

28 Ọ gālaghachi kwa n'ala-ya n'àkù uku; obi-ya gābu kwa imegide ọb͕ub͕a-ndu nsọ; ọ gēme kwa ihe, laghachi n'ala-ya.

29 Na mb͕e akara àkà ka ọ gābiaghachi, ba na Ndida; ma ọ gaghi-adi na mb͕e ikpe-azu otù ọ diri na mbu.

30 Ma ub͕ọ Kitim gābia imegide ya; obi-ya ewe mebie emebi, o we laghachi, wesa ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu oké iwe, me ihe, laghachi, tugharia uche na ndi nārapu ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu.

31 Ogwe-aka ufọdu gēsite kwa n'akuku-ya guzo, me ka ebe nsọ ahu ghara idi nsọ, bú ebe ahu siri ike, ha gēwezuga kwa àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, ha gēdo kwa ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.

32 Ọ bu kwa ndi nēmebi iwu megide ọb͕ub͕a-ndu ahu ka ọ gēmeru site n'ire-utọ di iche iche: ma ndi ahu nke mara Chineke-ha gādi ike, me ihe.

33 Ọzọ, ndi nwere uche n'etiti ndi Chineke gēme ka ọra madu ghọta ihe: ma ha gāsu ngọngọ site na mma'agha, site kwa n'ire-ọku, site kwa na ndọta-n'agha, site kwa na nluta-n'agha, ọtutu ubọchi.

34 Ma mb͕e ha nāsu ngọngọ agēyere ha aka nke-ntà: ma ọtutu madu gēji ire-utọ di iche iche rapara ha n'aru.

35 Ọzọ, ufọdu nime ndi ahu nwere uche gāsu ngọngọ, inucha ha, na ime ka ha di ọcha, na ime ka ha nwue ọcha, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: n'ihi na ọ fọduru idi na mb͕e akara àkà.

36 Eze ahu gēme kwa ka o si tọ ya; ọ gēbuli kwa onwe-ya, me onwe-ya uku n'elu chi nile ọ bula, ọ bu kwa Chineke nke chi nile ka ọ gēkwu oké okwu di iche iche megide: ọ gāga-kwa-ra ya nke-ọma rue mb͕e oké iwe gāgwusi; n'ihi na ihe akara àkà gēme.

37 Ma ọ gaghi-atughari uche na chi nile nke nna-ya-hà, ma-ọbu n'ihe ahu ndinyom nāchọsi ike, ọ bu kwa na chi nile ọ bula ka ọ nāgaghi-atughari uche: n'ihi na n'elu ihe nile ka ọ gēme onwe-ya uku.

38 Ma ọ bu chi nke ebe nile siri ike ka ọ gāsọpuru n'ọnọdu-ya: ọ bu kwa chi nke nna-ya-hà nāmaghi ka o gēji ọla-edo, ji kwa ọla-ọcha, ji kwa nkume di oké ọnu-ahia, ji kwa ihe di iche iche anāchọsi ike, sọpuru.

39 Ọ gēmeso kwa ebe nile ewusiri ike nke ebe nile siri ike site n'iye-aka chi ala ọzọ: onye ọ matara gēme ka nsọpuru-ya ba uba; ọ gēme kwa ka ha chia ọra madu, ọ bu kwa ala ka ọ gēkè n'ọnu-ahia.

40 Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga.

41 Ọ gābà kwa n'ala ahu mara nma, ọ di kwa ọtutu ala gāsu ngọngọ: ma ndia ka agēme ka ha wepuga onwe-ha n'aka-ya: Edom, na Moab, na ndi-isi n'umu Amon.

42 Ọ gēsetipu kwa aka-ya imegide ala nile: ala Ijipt agaghi-aghọ kwa ndi nāb͕apu ab͕apu.

43 Ma ọ gēnwe ike n'àkù nile nke ọla-edo na ọla-ọcha, na n'ihe nile anāchọsi ike nke Ijipt: ndi Libia na ndi Etiopia gēso kwa na nzọ-ukwu-ya nile.

44 Ma ihe di iche iche anuru site n'Ọwuwa-anyanwu, site kwa n'Ugwu, gēme ka ọ ma jijiji: ọ gēji kwa oké ọnuma pua ikpochapu na iwezuga ọtutu madu ka ebibie ha.

45 Ọ gāma kwa ulo-ikwū nile nke ulo uku ya n'etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahu mara nma; ma ọ gābiaru ọgwugwu-ya, ọ dighi kwa onye ganēyere ya aka.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12