9 O we si, La, Daniel: n'ihi na ezobewo okwu ndia, kachita kwa ha akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia.
10 Ọtutu madu gēme onwe-ha ka ha di ọcha, ha gēme onwe-ha ka ha nwue ọcha, agānucha kwa ha; ma ndi nēmebi iwu gēmebi iwu; ndi nile nke nēmebi iwu agaghi-aghọta kwa ihe: ma ndi ahu ndi nwere uche gāghọta.
11 Ma site na mb͕e agēwezuga àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, mb͕e agēdo ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nnù ubọchi atọ na ọgu ubọchi anọ na iri gādi.
12 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke nēchere, we biarute nnù ubọchi atọ na ọgu isi na iri na ise ahu.
13 Ma gi onwe-gi, la, rue ọgwugwu ihe ndia: i gēzu kwa ike, guzo ọtọ n'ebe ekeworo nye gi, n'ọgwugwu ubọchi ndia.