Daniel
isiakwụkwọ 2:1-7
Bible Nso
1Ma n'arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche; mọ-ya we basasia, ura-ya we gwu n'anya-ya.
2Eze we si ka akpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi-mb͕asi na ndi Kaldea igosi eze nrọ-ya nile. Ha we bata guzo n'iru eze.
3Eze we si ha, Nrọ ka m'rọworo, mọm we b͕asasia imara nrọ ahu.
4Ndi Kaldea we si eze n'asusu Siria, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: zere ndi-orù-gi nrọ ahu, isi-ya ka ayi gākọ kwa.
5Eze we za, si ndi Kaldea, Okwu nke siworo n'ọnum puta nēguzosi ike: asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a na isi-ya, agābọkasi unu, ọ bu kwa ulo nile unu ka agēme ebe-ikpofu-ahihia.
6Ma asi na unu akọ nrọ a na isi-ya, onyinye di iche iche na ugwọ-ọlu na nsọpuru uku ka unu gānata n'akam: n'ihi nka kọrọnum nrọ a na isi-ya.
7Ha zara nke ub͕ò abua, si, Ka eze zere ndi-orù-ya nrọ a, isi-ya ka ayi gākọ kwa.