32 Onyinyo ahu, isi-ya bu ezi ọla-edo, obi-ya na ogwe-aka-ya abua bu ọla-ọcha, afọ-ya na apata-ukwu-ya abua bu ọla,
33 ogwe-ukwu-ya abua bu ígwè, ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè ma ufọdu nime ha bu urọ.
34 I nọ nāhu rue mb͕e awaputara otù nkume nke anējighi aka wa, o we tie onyinyo ahu n'ukwu-ya abua nke bu ígwè na urọ, tipia ha.
35 Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile.
36 Nka bu nrọ ahu: isi-ya ka ayi gākọ kwa n'iru eze.
37 Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a;
38 ọzọ, n'ebe ọ bula umu nke madu di, anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe ka O nyeworo n'aka-gi, me ka i nwe ike n'aru ha nile: gi onwe-gi bu isi ọla-edo ahu.