Daniel
isiakwụkwọ 2:35-41
Bible Nso
35Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile.
36Nka bu nrọ ahu: isi-ya ka ayi gākọ kwa n'iru eze.
37Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a;
38ọzọ, n'ebe ọ bula umu nke madu di, anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe ka O nyeworo n'aka-gi, me ka i nwe ike n'aru ha nile: gi onwe-gi bu isi ọla-edo ahu.
39Ma n'ọnọdu gi ka ala-eze ọzọ gēbili nke gādi ala kari gi; na ala-eze ọzọ nke mere ha atọ, nke bu ọla, nke gēnwe ike n'aru uwa nka nile.
40Ma ala-eze nke-anọ gādi ike ka ígwè: n'ihi na ígwè nētipia tida kwa ihe nile: na dika ígwè nke nētijisi ihe ndia nile, otú a ka ọ gētipia, tijisia.
41Ma ebe i huru ukwu-ya abua na nkpisi-ukwu-ya nile, na ufọdu nime ha bu urọ ọkpu-ite, ma ufọdu nime ha bu ígwè, ala-eze ekewara ekewa ka ọ gābu; ma nguzosi-ike ufọdu nke ígwè ahu aghaghi idi nime ya, n'ihi na i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti.