Daniel
isiakwụkwọ 2:36-42
Bible Nso
36Nka bu nrọ ahu: isi-ya ka ayi gākọ kwa n'iru eze.
37Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a;
38ọzọ, n'ebe ọ bula umu nke madu di, anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe ka O nyeworo n'aka-gi, me ka i nwe ike n'aru ha nile: gi onwe-gi bu isi ọla-edo ahu.
39Ma n'ọnọdu gi ka ala-eze ọzọ gēbili nke gādi ala kari gi; na ala-eze ọzọ nke mere ha atọ, nke bu ọla, nke gēnwe ike n'aru uwa nka nile.
40Ma ala-eze nke-anọ gādi ike ka ígwè: n'ihi na ígwè nētipia tida kwa ihe nile: na dika ígwè nke nētijisi ihe ndia nile, otú a ka ọ gētipia, tijisia.
41Ma ebe i huru ukwu-ya abua na nkpisi-ukwu-ya nile, na ufọdu nime ha bu urọ ọkpu-ite, ma ufọdu nime ha bu ígwè, ala-eze ekewara ekewa ka ọ gābu; ma nguzosi-ike ufọdu nke ígwè ahu aghaghi idi nime ya, n'ihi na i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti.
42Ma nkpisi-ukwu nile nke ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè, ma ufọdu nime ha bu urọ, otú a ufọdu nime akuku ala-eze ahu gādi ike, ma ufọdu nime ya gābu ihe nādighi ike ntiwa.