Daniel
isiakwụkwọ 8:10-16
Bible Nso
10O we di uku rue usu ihe nile nke elu-igwe; o we me ka ufọdu nime usu ihe nile nke elu-igwe na nime kpakpando da n'ala, o we zọda ha ukwu.
11Ọbuná rue Onye-isi nke usu ahu ka o mere onwe-ya uku;ọ bu kwa n'aka-Ya ka ọ napuru àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, atuba-kwa-ra ọnọdu nke ebe nsọ Ya.
12Anēnye kwa ya usu-ndi-agha imegide àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum n'ihi nmehie; o we tuda ezi-okwu n'ala, me ihe, ihe ga-kwa-ra ya.
13M'we nu otù onye nsọ ka ọ nēkwu, otù onye nsọ we si onye ahu nke nēkwu okwu, Rùe ole mb͕e ka ọhù a gādi, bú nke àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na njehie ahu nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, inye ma ebe nsọ ma usu-ndi-agha ka azọda ha ukwu?
14O we sim, Rue nnù anyasi na ututu ise na ọgu iri-na-ise; ewe gua ebe nsọ n'ebe ezi omume.
15O rue, mb͕e m'huru ọhù ahu, ọbuná mu onwem, bú Daniel, na m'chọrọ nghọta; ma, le, ihe di ka nwoke di ike n'ile ya anya nēguzo n'irum.
16M'we nu olu madu n'etiti Ulai, o we kpọ, si, Gebriel, me ka onye a ghọta ọhùa.