1 Ijiji nwuru anwu nēme ka manu onye nāsugwa manu-otite nke nēsì ísì utọ sìe ísì ọjọ, re kwa ure: otú a ka nzuzu ntà di arọ́ kari amam-ihe, kari kwa nsọpuru.
2 Obi onye mara ihe di n'aka-nri-ya; ma obi onye-nzuzu di n'aka-ekpe-ya.
3 Ọzọ kwa, mb͕e onye-nzuzu nēje ije n'uzọ, obi-amam-ihe-ya nākọnari ya, ọ we si madu nile na onye-nzuzu ka ọ bu.
4 Ọ buru na mọ nke onye nāchi achi ebilie imegide gi, arapula ọnọdu-gi; n'ihi na ime-nwayọ nēme ka nmehie uku di iche iche kwusi.