Eklisiastis 1 IGBOB

1 Okwu nke Onye-nkpọkọta, bú nwa Devid, bú eze nime Jerusalem.

2 Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ihe nile bu ihe-efu.

3 Òle ihe fọduru madu nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu n'okpuru anyanwu?

4 Otù ọgbọ alá, ọb͕ọ ọzọ abia; ma uwa nēguzoru mb͕e ebighi-ebi.

5 Ọzọ, anyanwu awawo, anyanwu adawo kwa, ọ bu kwa ila n'ọnọdu-ya ka ọ nēkusi ume ike, bú ebe ọ nāwa.

6 Ifufe nēferu Ndida, we nēfe buruburu rue Ugwu; ọ nēfe buruburu mb͕e nile na nfeghari-ya, ọ bu kwa n'ife buruburu ya ka ifufe feghachiworo.

7 Osimiri nile nērùdaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughi eju, rue ebe osimiri nērùda, rue ebe ahu ka osimiri ahu nērùghachi ọzọ.

8 Ihe nile nādọb͕u onwe-ha n'ọlu; madu apughi ikwu ya: afọ adighi-eju anya n'ihu ihe, afọ adighi-eju kwa nti n'inu ihe.

9 Ihe ọ bula nke diworo, nke ahu bu ihe nke gādi; ọzọ, ihe ọ bula nke emeworo, nke ahu bu ihe nke agēme: ọ dighi kwa ihe ọhu di n'okpuru anyanwu.

10 Ọ̀ di ihe nke madu nāsi, Le nka, ihe ọhu ka ọ bu? na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo, na mb͕e nile ebighi-ebi nke buru ayi uzọ.

11 Ọ dighi ncheta diri ọb͕ọ mbu nile: ọzọ kwa, ọ dighi ncheta gādiri ọb͕ọ ikpe-azu nile nke gādi n'ọdi-n'iru, n'etiti ndi nādi mb͕e ha gasiri.

12 Mu onwem, bú Onye-nkpọkọta, abuwo eze Israel nime Jerusalem.

13 M'were kwa obim nye ichọ na iledo site n'amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n'okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n'ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n'ala.

14 Ahuwom ọlu nile nke aluworo n'okpuru anyanwu; ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

15 Ihe nke b͕agọrọ ab͕agọ, apughi ime ka ọ dizie: ọzọ, ihe-nkọnari, apughi iguta ya.

16 Mu onwem kpayere obim uka, si, Mu onwem, le, atukwasiwom n'onwem amam-ihe nke-uku kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: e, obim ahuwo amam-ihe na ihe-ọmuma ri nne.

17 M'we were obim nye ima amam-ihe, na ima iwi-ara na nzuzu: amawom na nka bu kwa ichọ ijide ifufe.

18 N'ihi na ọ bu n'ọtutu amam-ihe ka ọtutu nkpasu-iwe di: ọzọ, onye nātukwasi ihe-ọmuma nātukwasi ihe-nb͕u.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12