11 Okwu nile nke ndi mara ihe di ka ndudu eji achu ehi, ọzọ, dika ǹtú akumiri nke-ọma ka okwu nke ndi-nwe nzukọ di, bú okwu enyere site n'aka otù onye-ọzùzù-aturu.
12 Tukwasi kwa n'ihe ndia, nwam, nara ndum-ọdu: ime ọtutu akwukwọ enweghi ọgwugwu; ọtutu nmuta bu kwa ike-ọgwugwu nke anu-aru.
13 Ka ayi nuru nkwubì okwu a nile: tua egwu Chineke, debe kwa ihe nile Ọ nyere n'iwu; n'ihi na nka bu ọlu madu nile.
14 N'ihi na ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n'ikpé, ya na ihe ọ bula zoro ezo, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ.