1 Mu onwem siri n'obim, Biko, bia, m'gēji ọṅù nwa gi; gi lekwasi kwa ezi ihe anya: ma, le, nke ahu bu kwa ihe-efu.
2 Ekwurum okwu bayere ichì-ọchì, si, Ọ nāwi ara: m'kwu-kwa-ra okwu bayere ọṅù, si, Gini kwa ka ọ nēme?
3 Eledorom n'obim iji manya-vine me ka obi tọ anu-arum utọ, (ma obim nēdum n'amam-ihe), na ijide nzuzu, rue mb͕e m'gāhu ihe ezi ihe ahu bu nke diri umu madu, bú nke ha gēme n'okpuru elu-igwe ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ha.
4 Emerem ka ọlum nile di uku; ewurum onwem ulo di iche iche, kuara onwem ubi-vine di iche iche,
5 mere onwem ubi di iche iche ab͕ara ogige na ogige ọma di iche iche, m'we kua osisi nāmi nkpuru nile di iche iche nime ha:
6 emerem onwem ọdọ-miri, isite na ha de oké ọhia nēpu osisi:
7 ab͕ataram orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, umu-ulo di-kwa-ram; ọtutu ihe-nnweta, bú ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, di-kwa-ram, kari ndi nile burum uzọ nime Jerusalem: