1 Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ihe riri nne ka ọ bu kwa n'aru madu:
2 madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa.
3 Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n'ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya:
4 N'ihi na n'ihe-efu ka ọ biara, ọ bu kwa n'ọchichiri ka ọ nāla, eji kwa ọchichiri kpuchi aha-ya;
5 ọzọ, ọ hughi anyanwu, ọ maghi kwa ihe ọ bula; izu-ike diri nka kari onye ahu: