11 Amam-ihe di nma dika ihe-nketa: e, ọ dikariri ndi nāhu anyanwu anya nma.
12 N'ihi na amam-ihe bu ǹdò, ego bu kwa ǹdò: ma ọkaka nke ihe-ọmuma bu, na amam-ihe nēme ka onye-nwe-ya di ndu.
13 Le ọlu Chineke: n'ihi na ònye puru ime ka ọ dizie, bú ihe O meworo ka ọ b͕agọ?
14 N'ubọchi ọdi-nma-gi nọ n'ọdi-nma, ma n'ubọchi ọdi-njọ le anya: ọbuná otù na nso ibe-ya ka Chineke meworo ha, ka madu we ghara ichọputa ihe ọ bula nke gādi mb͕e ọ gasiri.
15 Ihe nile a ka m'huworo n'ubọchi nile nke ihe-efum: onye ezi omume di nke nāla n'iyì n'ezi omume-ya, onye nēmebi iwu di kwa nke nēme ka ndu-ya di ogologo n'ihe ọjọ ya.
16 Abubigala onye ezi omume ókè; eme-kwa-la onwe-gi onye mabigara ihe ókè: n'ìhi gini ka i gēmebi onwe-gi?
17 Emebibigala iwu ókè, abu-kwa-la onye-nzuzu: n'ìhi gini ka i gānwuchu anwuchu?