15 Ihe nile a ka m'huworo n'ubọchi nile nke ihe-efum: onye ezi omume di nke nāla n'iyì n'ezi omume-ya, onye nēmebi iwu di kwa nke nēme ka ndu-ya di ogologo n'ihe ọjọ ya.
16 Abubigala onye ezi omume ókè; eme-kwa-la onwe-gi onye mabigara ihe ókè: n'ìhi gini ka i gēmebi onwe-gi?
17 Emebibigala iwu ókè, abu-kwa-la onye-nzuzu: n'ìhi gini ka i gānwuchu anwuchu?
18 Ọ di nma ka i jide nka; ọzọ kwa, esepula aka-gi na nka: n'ihi na onye nātu egwu Chineke gāputa n'etiti ha nile.
19 Amam-ihe nēme ka onye mara ihe di ike kari madu iri ndi nāchi achi ndi nọ n'obodo.
20 N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.
21 Ọzọ, atukwasila obi-gi n'okwu nile anēkwu; ka i we ghara inu ka orù-gi nākọcha gi: