17 Emebibigala iwu ókè, abu-kwa-la onye-nzuzu: n'ìhi gini ka i gānwuchu anwuchu?
18 Ọ di nma ka i jide nka; ọzọ kwa, esepula aka-gi na nka: n'ihi na onye nātu egwu Chineke gāputa n'etiti ha nile.
19 Amam-ihe nēme ka onye mara ihe di ike kari madu iri ndi nāchi achi ndi nọ n'obodo.
20 N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.
21 Ọzọ, atukwasila obi-gi n'okwu nile anēkwu; ka i we ghara inu ka orù-gi nākọcha gi:
22 N'ihi na ọtutu mb͕e obi-gi maworo na gi onwe-gi akọchawo ndi ọzọ.
23 Ihe nile a ka m'nwaworo n'amam-ihe: m'siri, M'gāma ihe; ma nke ahu di anya n'ebe m'nọ.