1 Ònye di ka onye mara ihe? ònye nāma kwa akukọ-isi okwu? Amam-ihe madu nēnye iru-ya ìhè, ike nke iru-ya nāb͕anwe kwa.
2 Mu onwem nādu gi ọdu, Debe okwu-ọnu eze, ọbuná n'ihi ọṅuṅu-iyi Chineke.
3 Esila n'iru ya pua ọsọsọ; eguzola n'ihe ọjọ: n'ihi na ihe ọ bula nke nātọ ya utọ ka ọ nēme.
4 N'ihi na okwu eze nwere ike; ònye gāsi kwa ya, Gini ka i nēme?
5 Onye nēdebe ihe enyere n'iwu agaghi-ama ihe ọjọ; ọzọ, mb͕e na ikpé ka obi onye mara ihe nāmata.