Eklisiastis 9:1-7 IGBOB

1 N'ihi na ihe nile a ka m'tiyere n'obim, ọbuná iledo ihe nile a; na ndi ezi omume, na ndi mara ihe, na òfùfè-ha nile, di n'aka Chineke: ma ọ bu ihu-n'anya ma-ọbu ikpọ-asì, madu adighi-ama ya; ihe nile di n'iru ha.

2 Ihe nile nādakwasi madu nile n'otù uzọ ahu: otù ndabà nādabàra onye ezi omume, dabà-kwa-ra onye nēmebi iwu; ọ nādabàra ezi madu, dabà-kwa-ra onye di ọcha, dabà-kwa-ra onye nādighi ọcha; ọ nādabàra onye nāchu àjà, dabà-kwa-ra onye nādighi-achu àjà: dika ezi madu si di, otú a ka onye-nmehie di kwa; onye nāṅu iyi di ka onye nātu egwu ọṅuṅu-iyi.

3 Nka bu ihe ọjọ n'ihe nile anēme n'okpuru elu-igwe, na otù ndabà nādabàra madu nile: ọzọ kwa, obi umu madu juputara n'ihe ọjọ, iwi-ara di kwa n'obi-ha mb͕e ha nọ na ndu, ma emesia ha nālakuru ndi nwuru anwu.

4 N'ihi na onye ọ bula nke ejikọtaworo ya na ndi nile di ndu, o nwere ntukwasi-obi: n'ihi na ọ diri nkita di ndu nma kari ọdum nwuru anwu.

5 N'ihi na ndi di ndu mara na ha gānwu: ma ndi nwuru anwu adighi-ama ihe ọ bula, ọ dighi kwa ugwọ-ọlu ha nwere ọzọ; n'ihi na echezọwo ncheta-ha.

6 Ma ihu-n'anya-ha, ma ikpọ-asì-ha, ma ekworo-ha, na mb͕e di anya gara aga ka ọ laworo n'iyì; ọ dighi kwa òkè ha nwere ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi n'ihe ọ bula nke emeworo n'okpuru anyanwu.

7 Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga.