10 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we bilie, si ha, Unu onwe-unu emekpuwo emekpu, luta ndinyom ala ọzọ, itukwasi ihe n'ikpe-ọmuma Israel.
11 Ma ub͕u a nyenu Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, ekele, me kwa ihe nātọ Ya utọ: kewaputa-kwa-nu onwe-unu n'aru ndi di iche iche nke ala nka, na n'aru ndinyom ala ọzọ.
12 Nkpọkọta ahu nile we were oké olu za, si, O ziri ezi, dika okwu-gi nile n'ebe ayi nọ si di, ayi aghaghi ime otú a.
13 Ma ndi Israel di ọtutu, ọ bu kwa mb͕e oké miri-ozuzo, ike adighi kwa ayi iguzo n'èzí, ma ozi a abughi nke otù ubọchi, ọ bughi kwa nke ubọchi abua: n'ihi na ayi ejehiewo ri nne n'okwu a.
14 Biko, ka ndi-isi-ayi guzoro nkpọkọta nka nile, ka ndi nile ndi nọ n'obodo nile ayi bia kwa na mb͕e ezubere, bú ndi lutara ndinyom ala ọzọ, ha na ndi-okenye obodo nile ọ bula, na ndi-ikpe-ya, rue mb͕e iwe ọku nke Chineke-ayi bayere okwu a si n'aru ayi laghachi.
15 Otú ọ di, Jonatan nwa Asahel na Jahzeia nwa Tikva guzoro imegide ihe a: Meshulam na Shabetai, bú onye Livai, yekwara ha aka.
16 Umu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me otú a. Ewe kewapu Ezra, bú onye-nchu-àjà, na ndikom ọzọ, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha nile n'aha-ha kwa; ha we nọdu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-iri ka ha we jua ajuju okwu a.