7 rapunu ọlu ulo a nke Chineke; kwe ka onye-isi ndi-Ju na ndi-okenye ndi-Ju wue ulo a nke Chineke n'ọnọdu-ya.
8 Anēsite kwa n'akam nye iwu bayere ihe unu gēme ndi-okenye ahu nke ndi-Ju iwu ulo a nke Chineke: ka eme ngwa si n'àkù eze, bú nke sitere n'utu anātu n'ofè osimiri, nye ndikom ahu ego iji lu ọlu ahu, ka ha ghara ikwusi.
9 Ihe di kwa ha nkpà, ma umu-oke-ehi, ma ebulu, ma umu-aturu, iji churu Chineke nke elu-igwe àjà-nsure-ọku, ma ọka wheat, ma nnú, ma manya-vine, ma manu, dika okwu-ọnu ndi-nchu-àjà si di, bú ndi nọ na Jerusalem, ka ewere ya nye ha kwa-ubọchi nēmehiegh:
10 ka ha we nēweta nso ihe ísì utọ nye Chineke nke elu-igwe, nēkpe kwa ekpere bayere ndu eze, na nke umu-ya ndikom.
11 Anēsite kwa n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke gāb͕anwe okwu a, ka adọputa osisi n'ulo-ya, bulie onye ahu kpọgide ya n'elu ya; ka eme kwa ulo-ya ebe-ikpofu-ahihia n'ihi nka:
12 Chineke kwa Nke mere aha-Ya ka o biri n'ebe ahu, Ya tudà eze na ndi ọ bula nke gēseti aka-ya ib͕anwe okwu a, na ime ka ulo a nke Chineke nke di na Jerusalem la n'iyì. Mu onwem, bú Dariọs, enyewo iwu; ka ewere ngwa ngwa me ya.
13 Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.