28 M'we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà.
29 Nechenu ha nche, debe kwa ha, rue mb͕e unu tùru ha n'iru ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, nime Jerusalem, n'ime-ulo nke ulo Jehova.
30 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we nara ọtùtù nke ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile, ibūru ha biarue Jerusalem rue ulo Chineke-ayi.
31 Ayi we si n'osimiri Ahava n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n'aru ayi, O we naputa ayi n'aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n'uzọ.
32 Ayi we biarue Jerusalem, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ.
33 Ma n'ubọchi nke-anọ ka atùru ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile n'ulo Chineke-ayi nye n'aka Meremot, nwa Uraia, bú onye-nchu-àjà; Eleeza nwa Finehas nọye-kwa-ra ya; Jozabad nwa Jeshua na Noadaia nwa Binui, bú ndi Livai, nọye-kwa-ra ha;
34 n'ọnu-ọgugu na n'ọtùtù ka enyere ha ihe ọ bula: ewe de ọtùtù nile n'akwukwọ na mb͕e ahu.