9 Ha nile nābia ime ihe-ike; edosiri iru-ha ike dika ifufe Iru-anyanwu; ha we chikọta ndi adọtara n'agha dika ájá.
10 E, mba ahu nākwa ndi-eze emò, ndi-isi bu-kwa-ra ya ihe-ichì-ọchì: mba ahu nāchì ebe ọ bula ewusiri ike ọchì; n'ihi na o nēkpokọba ájá, we were ya.
11 Mb͕e ahu ọ gēfebiga dika ifufe, o we gabiga, ikpe ama ya: ike-ya nka ewe ghọ chi-ya.
12 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi siteworo na mb͕e ochie, Jehova, bú Chinekem, Onye Nsọm? ayi agaghi-anwu. Jehova, ọ bu ikpe ikpe ka I doworo ya; Gi Oké Nkume, ọ bu kwa iba nba ka I tọworo ya ntọ-ala.
13 Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n'ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n'ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;
14 I we me madu ka ha di ka azù nke oké osimiri, dika ihe nākpu akpu, nke nēnweghi onye nāchi ha?
15 Ha nile ka o ji nkò-azù dọkpuru, o nēkpochapu ha n'eriri-ya, chikọta ha n'ub͕u-ya: n'ihi nka ka ọ nāṅuri, tegharia egwú ọṅù.