1 Okwu Jehova nke ruru Hosea nwa Beeri nti n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel.
2 Isi-nmalite nke ikwu-okwu Jehova n'ọnu Hosea. Jehova we si Hosea, Je, luru n'onwe-gi nwunye nke nākwa iko na umu amuru n'ikwa-iko: n'ihi na ala nka nākwa iko nke-uku, ghara iso Jehova.
3 O we je luru Gomea nwa-nwayi Diblaim; owe turu ime, mutara ya nwa-nwoke.
4 Jehova we si ya, Kpọ aha-ya Jezreel; n'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, M'gēwere ọbara Jezreel leta ulo Jihu, M'gēme kwa ka ala-eze ulo Israel kwusi.
5 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gāb͕aji uta Israel nime ndagwurugwu Jezreel.