4 Jehova we si ya, Kpọ aha-ya Jezreel; n'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, M'gēwere ọbara Jezreel leta ulo Jihu, M'gēme kwa ka ala-eze ulo Israel kwusi.
5 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gāb͕aji uta Israel nime ndagwurugwu Jezreel.
6 O we turu ime ọzọ, mua nwa-nwanyi. Jehova we si Hosea, Kpọ aha-ya Lo-ruhama: n'ihi na M'gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel ọzọ, ka M'we bupuru ha nmehie-ha ma-ọli.
7 Ma n'aru ulo Juda ka M'gēnwe obi-ebere, M'gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M'gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha.
8 O we me ka Lo-ruhama rapu ara, o we turu ime, mua nwa-nwoke.
9 Jehova we si, Kpọ aha-ya Lo-ami: n'ihi na unu onwe-unu abughi ndim, Mu onwem agaghi-abu-kwa-ra unu Chineke.
10 Ma ọnu-ọgugu umu Israel gādi ka ájá oké osimiri, nke anāgagh ātùta, nke anāgaghi-agu kwa ọnu; ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke anāsi ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, n'ebe ahu ka agāsi ha, Umu Chineke di ndu ka unu bu.