9 M'gaghi-emezu idi-ọku nke iwem, M'gaghi-alaghachi ibibi Efraim: n'ihi na Chineke ka M'bu, abughm madu; n'etiti gi ka Mu, bú Onye nsọ, nọ: M'gaghi-abata kwa n'obodo.
10 Jehova ka ha gējeso, dika ọdum ka Ọ gāb͕ọ uja; N'ihi na Ya onwe-ya gāb͕ọ uja, umu gesi kwa n'Ọdida-anyanwu bia nāma jijiji.
11 Ha gēsi n'Ijipt bia nāma jijiji dika nnunu, si kwa n'ala Asiria dika nduru: M'gēme kwa ka ha biri n'ulo nile ha: ọ bu ihe si n'ọnu Jehovaa puta.
12 Efraim ji okwu-ugha ab͕am buruburu, ọ bu kwa aghughọ ka ulo Israel ji: Juda nọ kwa nālupu alupu n'aka Chineke, bú n'aka Onye kachasi nsọ Nke kwesiri ntukwasi-obi.