1 Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n'ihi na unu ka ikpé a diri; n'ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n'elu Teboa.
2 Ndi-njehie abamiwo n'ib͕u madu; ma mu onwem bu onye nādọ ha nile aka na nti.
3 Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n'ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel.
4 Omume nile ha agaghi-ekwe ha ichighakute Chineke-ha: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile di nime ha, ọ bu kwa Jehova ka ha nāmaghi.
5 Npako Israel azawo kwa oku n'iru ya: Israel na Efraim gāsu kwa ngọngọ n'ajọ omume-ha; Juda esowo kwa ha su ngọngọ.
6 Ha gāchiri ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha je ichọ Jehova; ma ha agaghi-achọta Ya: O seputawo Onwe-ya n'aru ha.
7 Jehova ka ha ghọb͕uworo; n'ihi na umu nābughi nke Ya ka ha muworo: ub͕u a ka ọnwa ọhu gēripia ha, ha na òkè nile ha.