1 Bianu, ka ayi laghachikute Jehova: n'ihi na Ya onwe-ya adọkawo, Ọ gāgwọ kwa ayi; O tib͕uwo, Ọ gēkechi kwa ayi.
2 Ọ gēme ka ayi dighachi ndu mb͕e ubọchi abua gasiri: n'ubọchi nke-atọ ka Ọ gēme ka ayi bilie, ayi ewe di ndu n'iru Ya.
3 Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.
4 Gini ka M'gēme gi, Efraim? gini ka M'gēme gi, Juda? n'ihi na ebere-unu di ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu.