2 Ma ha adighi-asi n'obi-ha na ọ bu ihe ọjọ nile ha ka M'chetaworo: ub͕u a ka omume nile ha b͕aworo ha buruburu; na ncherita-irum ka ha di.
3 Ha ji ihe ọjọ ha eme ka eze ṅuria, ji kwa okwu-ugha nile ha eme ka ndi-isi ṅuria.
4 Ha nile bu ndi nākwa iko; ha di ka ite-ọku uku nke osi-ite meworo ka ọ di ọku; ọ kwusiri ikpọnwu site na mb͕e edoziri utu ọka flour agwọrọ agwọ rue mb͕e emere ka o ko eko.
5 N'ubọchi eze-ayi ndi-isi jiri idi-ọku nke manya-vine ria ọria; o soro ndi nākwa emò setia aka-ya.
6 N'ihi na ha ebutewo obi-ha nso dika ite-ọku uku, mb͕e ha nēche anwu: ogologo abali nile ka osi-ite-ha nāraru ura; n'ututu ihe ahu nēre dika ọku nēnwu enwu.
7 Ha nile di ọku ka ite-ọku uku, ha ewe ripia ndi-ikpe-ha; ndi-eze nile ha adawo n'ala: ọ dighi onye nākpọkum n'etiti ha.
8 Efraim, n'etiti ndi nile di iche iche ka ya onwe-ya nāgwa onwe-ya ọgwa; Efraim aghọwo ob͕e achicha nke anātugharighi atughari.