8 Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we jegharia, onye ọ bula n'isi-ike nke obi ọjọ ha: M'we me ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a biakwasi ha, bú nke M'nyere n'iwu ka ha me, ma ha emeghi ha.
9 Jehova we sim, Achọputawo nkekọta imegidem n'etiti ndi Juda, na n'etiti ndi bi na Jerusalem.
10 Ha alaghachikuruwo ajọ omume nile nke ndi bu nna-ochie-ha, ndi juru inu okwum nile; ha onwe-ha ejesowo kwa chi ọzọ di iche iche ifè ha òfùfè: ulo Israel na ulo Juda emebiwo ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara.
11 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ, nke ha nāpughi isi nime ya puta, biakute ha; ha gētikukwam, ma M'gaghi-ege ha nti.
12 Obodo nile nke Juda na ndi bi na Jerusalem gēje kwa tikuru chi nile nke ha onwe-ha nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ma ọ dighi nzọputa ma-ọli ha gāzọputa ha na mb͕e ihe ọjọ ha.
13 N'ihi na ka ọnu-ọgugu obodo-gi ra, otú a ka chi-gi nile di, gi Juda; ka ọnu-ọgugu èzí Jerusalem ra kwa, otú a ka unu doworo ebe-ichu-àjà nye ihe-ihere ahu, bú ebe-ichu-àjà isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
14 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha: n'ihi na M'gaghi-nānu olu-ha na mb͕e ha nākpokum n'ihi ihe ọjọ ha.